Lee nkata ọhụrụ Gọọmentị etiti na-akpa n'isi Simon Ekpa iji kpọlata ya na Naịjirịa

Christopher Musa na Simon Ekpa

Ebe foto si, DHQ/Ekpa/Facebook

Onyeisi nchekwa na Naịjirịa bụ ọchịagha Christopher Musa ekwuola na gọọmentị Naịjirịa ezigaraala ogbo ya nke Finland akwụkwọ akaebe niile ha chọrọ iji hụụ a kpọlatara Simon Ekpa na Naịjirịa.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị Channels TV nwere n'ụbọchị 31 Disemba afọ 2024 n'emume nchịkọta ihe mere n'afọ a kpọro '2024 Year-In-Review Programme'.

N'okwu ya "Odoro m anya na ahụ na-ajụ ya oyi ebe ọ nọ ugbua, anyị ga-eji ụzọ iwu gbasoo ya n'usoro. Achọghị m ikwu ọtụtụ okwu banyere ya mana obi dị m ụtọ na a nwụchiri ya.

"Gọọmentị etiti ezigaraala gọọmentị mba Finland ihe ndị a chọrọ iji kpọlata ya. Ya mere, odoro m anya na a ga-eme ihe ziri ezi," ka o gbakwụnyere.

Ọchịagha Musa kwukwara na atụmatụ ịnọ n'ụlọ nke Ekpa hiwere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na ha ebelata maka etu ndịagha si akpa ike n'ọrụ n'ebe ahụ.

Cheta na ndị nchekwa na mba Finland nwụchiri Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ n'ọnwa Nọvemba 2024 n'ihi ebubo ndị metụtara iyi ndụ egwu, ịkpalite iyi ndụ egwu nakwa iji ego kwalite ya.

E boro ya ebubo na o ji soshal midia iji na-ekesa akụkọ ụgha nke metụtara otu chọrọ nwereonwe ha site na Naịjirịa bụ Indigenous People of Biafra (IPOB).

Nke a mere ka ụlọikpe dị na mpaghara Lahti nke mba Finland jiri nye iwu sị ka a kpọchie Ekpa na ndị ọzọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ruo mgbe a ga-achabi ikpe ha.

Ọkaiwu Simon Ekpa ekwuola na enweghị onye ma mgbe a ga-atọhapụ ya

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa/X

Nkọwa foto, Simon Ekpa

Akụkọ anyị na-enweta na-ekwu na ọkaiwu na-anọchiteanya Simon Ekpa bụ Ilkka Kopra ekwuola na ọ bụ eziokwu na ụlọikpe mpaghara Päijät-Häme nyere iwu ka a kpọchie imon Ekpa n'ụlọmkpọrọ Kylmäkoski, mana ọzọ dịka ibe ya bụ na enweghị onye ma mgbe Simon Ekpe nwereike ịpụta n'ụlọmkpọrọ ahụ.

Ọkaiwu Kopra kwuru na ya amaghị mgbe ụlọikpe ahụ ga-akpọlite ikpe Simon Ekpa mana ha na-agba mbọ ime ka Ekpa nwere onwe ya.

N'okwu ya, "A gam eme ihe niile mụ nwereike ime iji hụ na imon Ekpa nwere onwe n'oge na-adịghị anya".

Cheta na ndị uweojii mba Finland nwụchiri Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ ma kpụpụ ha ụlọikpe maka ebubo iji intanet na-enyi ọha egwu ma na-anapụ ndị mmadụ ego.

Onye uweojii na-eme Simon Ekpa nyocha bụ Otto Hiltunen kwuru na ha na ndị uweojii sị mba ọzọ jikoro aka ọnụ nwere mee nyocha ahụ tupuu ha anwuchie Ekpa na mmadụ anọ ndị ahụ.

E nwereike ịkpọlata Simon Ekpa ma kpee ya ikpe na Naịjirịa?

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa/X

Nkọwa foto, Simon Ekpa

Kemgbe ndị uweojii mba Finland nwụchiri Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ maka ebubo ịyị ọha egwu na Naịjirịa, ọtụtụ mmadụ amalitela ịkpọ oku ka gọọmenti Finland kpọlata ya na Naịjirịa maka ikpe ya.

Nke na-abịa ka ụlọikpe dị na Päijät-Häme nyere iwu ka a kpọchie Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ n'ụlọmkpọrọ.

Cheta na ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Gusau kwuru na ha na-atụanya na gọọmenti Finland ga-akpọlata Simon Ekpa Naịjirịa ka e kpe ya ikpe.

Maka gọọmenti Finland a ga-akpọlata Simon Ekpa na Naịjriịa ka e kpe ya ikpe?

Kedụ ka e si akpọlata mmadụ site na mba ọzọ maka ikpe ya ikpe

Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụghị iwu na mba kwụrụ onwe ya ga-enyefe onye omekome n'aka mba ọzọ, Nke a bụ maka na mba ọbụla kwụrụ onwe ya nwere ikike n'isi onye ọbụla bi n'ime ya.

Ọ bụ n'ihi nka a ka a ga-enwe nkwekọrịta n'etiti mba abụọ tupu ha enweike inyefe onye omekome ọbụla n'aka ibe ha.

Ọzọkwa, mba ahụ na-arịọ ka a kpụnye ha onye omekome, ga-enwe ihe akaebe gbara ọkpọrụkpụ iji gosi na onye omekome ahụ kpara arụ n'obodo ha maọbụ na ọ kpara arụ nwereike imetuta ndị obodo.

Onye ọkaiwu bụ Chukwuma Ezeala kwuru sị: "Iyi ọha egwu bụ mpụ mba ụwa, ma dịka akwụkwọ ibinye aka Rome Status si kwuo, ndị niile binyere aka n'akwụkwọ Status ahụ ga-akwadorịrị ijide, ntaramahụhụ na igbochi iyi ọha egwu. Ka ọ dị ugbua, Naịjirịa na na Finland bụ ndị bịanyere aka n'akwụkwọ Rome Status."

O kwuru na ebe ọ bụ na iyi ọha egwu bụ mpụ mba ụwa, e nwereike ịkpụlata Simon Ekpa na Naịjirịa mana ọ naanị oge Naịjirịa mezuru ihe niile ha kwesịrị ime, ka nke a nwereike ime.

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa/X

Nkọwa foto, Simon Ekpa

Vince Onyekwelu bụbu onye uweojii mba Briten ma bụrụkwa onye maara ihe ekwe na-akụ banyere nchekwa, kwuru na ihe ọzọ nwereike igbochi mba inyefe mba ọzọ onye omekome ha nwuchiri bụ ma ọ bụrụ na mba na-arịọ ka e nyefe ha onye omekome ahụ anaghị ichekwa ikike ruru mmadụ dịka iwu siri kwuo.

Ọ gara n'ihu kwuo na Simon Ekpa bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Finland kemgbe afọ 2017 tinyere na ọ bụ onye otu National Coalition Party nọ n'ọchịchị ugbua na Finland. Ọ gbakwụnyere na Simon Ekpa bụbu onye agha mba Finland.

Ihe ndị a niile ka Vince Onyekwelu kwuru na Naịjirịa kwesịrị ilebanye anya na ya dịka ha na-akpọ oku ka Finland nyefe ha Simon Ekpa maka ikpe ya ikpe.

N'aka nke ọzọ, Uche Mefor bụbu osote Nnamdi Kanu, kwuru na ọ rara ahụ mba Finland inyefe Naịjirịa Simon Ekpa maka na ọ bụ nwaamala Finland (citizen). O kwuru na ọ bụrụ na ụlọikpe maa Ekpa ikpe ma tụọ ya mkpọrọ, ọ bụ ụlọmkpọrọ dị na Finland ka ọ ga-anọ

Simon Ekpa bụ ekperima amaghị ihe ọbụla gbasara Biafra – Peter Mbah

Gọvanọ Peter Mbah na Simon Ekpa

Ebe foto si, Peter Mbah, Simon Ekpa/X

Gọọmenti Enugwu steeti etoola Gọọmenti Fịnland maka ịnwụchi onye ndu otu Autopilot bi na mba ahụ bụ Simon Ekpa ma kọwaa ya dịka onye oyi ndụ egwu na-ebughị ọdịmma ndị Igbo n’obi.

Nke a dị n’ozi odeakwụkwọ Gọọmenti Enugwu steeti bụ Chidiebere Onyia wepụtara n’ụbọchị Fraịde 22 Nọvemba 2024.

Ozi ahụ kọwara Simon Ekpa dịka onye na-egbu mmadụ na onye na-egwu chandum nakwa onye na-enwe obiụtọ igbu ndị agbụrụ ya.

O kwuru na Gọọmenti Enugwu steeti dị ezigbo njikere iwepụta ihe akaebe gbasara arụ dị iche iche Simon Ekpa mere n’ala Igbo iji nye aka n’ikpe ya na mba Fịnland maọbụ Naịjirịa.

Ozi ahụ kwuru na Gọọmenti Enugwu nabatara nnwụchi ahụ ma kwuo na ọ ga-enye aka iweta udo, nchekwa na ezi ọnọdụ na mpaghara ala Igbo niile.

Ohanaeze Ndigbo ekwuola na nnwuchi Simon Ekpa ga-eweta udo n'ala Igbo

Foto Simon Ekpa na njirimara Ohanaeze

Ebe foto si, Simon Ekpa/Ohanaeze/X

Nkọwa foto, Foto Simon Ekpa na njirimara Ohanaeze

Ohanaeze Ndigbo apụtala kwuo ihe bụ uche ha banyere nwuchi ndị uweojii mba Finland nwuchiri Simon Ekpa.

Onyeisi mgbasaozi Ohanaeze Ndigbo bụ Chiedozie Alex Ogbonnaya gwara BBC Igbo na enweghị oge ọbụla hiri kwado ọnọdụ sit-at-home na-eme kwa Mọnde ọbụla na steeti ise dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa maka na ọbuteel oké ihe mgbu nye mpaghara ahụ dịka ajọ ọnọdụ akụanụba, azụmahịa nakwa ọnwụ ọtụtụ mmadụ.

N'okwu ya 'Ohanaeze Ndigbo ariọla Simon Ekpa ugboro ugboro ka ọ machie ọnọdụ sit-at-home ahụ mana o geghị ha ntị'.

Ọ gara n'ihu katọọ atụmatụ ịmanye ọnọdụ sit-at-home ma kwuo na nwuchi Simon Ekpa ga-enweta udo ma belata oké iyi ọha egwu na mpaghara ahụ.

N'ikpeazụ, Alex Ogbonnaya kwuru na Ohanaeze Ndigbo bụ naanị ihe ga-enweta udo, mmepe, ị dị n'otu na agamnihu ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka ha ga na-akwado

Anyị amaghị Simon Ekpa a nwụchiri na Finland - Ipob

Foto ọkọlọtọ otu Ipob na Simon Ekpa

Ebe foto si, Getty Images/ Simon Ekpa/X

Nkọwa foto, Foto ọkọlọtọ otu Ipob na Simon Ekpa

Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola ha amaghị onye Simon Ekpa bụ maka na ọ bụghị onye otu ha.

Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful wepụtara, katọrọ akụkọ n’efegharị nke na-ekwu na Ekpa bụ onye otu Ipob ma kwusie ike na enweghị ihe gbasara ndị Ipob na Simon Ekpa.

Emma Powerful kwuru na “Ọ bụ eziokwu na Ipob nwere ngalaba na Finland mana Simon Ekpa edebanyeghị aha ya dịka onye otu ha na mba ahụ maọbụ na-ebe ọzọ na mba ụwa niile”.

Ozi ya mere ka o doo anya na kemgbe afọ iri abụọ (20) Ipob malitere ịkpọ oku maka nwereonwe Biafra, ha ejighị ngwaagha maọbụ ọgbaaghara nwere na-akpọ oku a n’agbanyeghị na gọọmentị dị icheiche etinyela ọgbatuhie n’oku ha ma ghara ige ha ntị.

Ọ gara n’ihu katọọ etu Simon Ekpa onye na-kpọ onwe ya Praịm Mịnịsta gọọmentị Biafra nọ na mba Finland na ndịagha ọ kpọrọ “Biafra Liberation Army” si na-ebuta nnukwu ọgbaaghara na ndida ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nke tagoro isi ọtụtụ mmadụ, mebie ụlọ, ụgbọala ma mee ka ọnọdụ akụnaụba mpaghara ahụ kpụọ afọ n’ala site n’imajinye ọnọdụ Sit-At-Home kwa Mọnde ọbụla kemgbe ihe ruru afọ atọ ugbua.

Ihe ndịagha kwuru maka nwụchi Simon Ekpa na Finland

Onye nọchiri anya onyeisi ndị agha bụ Oluyede na Simon Ekpa

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X/Simon Ekpa/Facebook

Ndị agha Naịjirịa egosila obi ụtọ na nwụchi na mkpọpụ ụlọikpe nke emere Simon Ekpa bụ onyeisi Autopilots bụ otu alaka n'otu Ipob na mba Finland.

N'ọzi nke onye na-elekọta mgbasaozi ndị agha bụ Tukur Gusau ziteere BBC, o kwuru sị "anyị nwere olileanya na nke a ga-abụ ụzọ mbụ na mkpọbata ya n'ala Naịjirịa ka ekpee ya ikpe"

Cheta na ndị uweojii mba Finland na-ana ụlọikpe ikike ijideso Ekpa n'ụlọ nga ganye mgbe a ga-emecha nyocha n'ebubo ndị eboro ya.

Ndị uweojii mba Finland kwukwara na nyocha ha na-eme si na njikọ aka ha na mba ndị ọzọ mana o doghi anya maọbụ mba Naịjirịa ka ha na ha nwere njikọ aka a.

Mmadụ anọ ndị ọzọ anwụchiri ha na Ekpa bụ ndị a sị na-etinye ego iji kwalite ọrụ iyindụegwu nke Ekpa na-eme.

Ụlọikpe enyochawala Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ na mba Finland

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook

Nkọwa foto, Simon Ekpa

Ndị uweojii na mba Finland akpụpụla Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ n'ụlọikpe maka ebubo iji intanet na-enyi ọha egwu ma na-anapụ ndị mmadụ ego.

Ndị uweojii na-agwa ụlọikpe ahụ dị na Päijät-Häme, Finland ka e ziga Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ahụ n'ụlọnga.

Mana ugbua, ụlọikpe ahụ dị na Päijät-Häme na-atule ka ha mara na ha aga-eme ihe ndị uweojii chọrọ.

Cheta na Ekpa nwere akwụkwọ njirimara nwafọ mba Finland nakwa nke mba Naịjirịa.

Onye uweojii na-eme Simon Ekpa nyocha bụ Otto Hiltunen kwuru na ha na ndị uweojii sị mba ọzọ jikoro aka ọnụ nwere mee nyocha ahụ tupuu ha anwuchie Ekpa na mmadụ anọ ndị ahụ.

Otto Hiltunen kwuru na ebubo e boro mmadụ anọ ndị ahụ so Ekpa nọrọ n'aka ndị uweojii bụ na ha jị ego ha na-akwado ịyị ọha egwu.

Mana n'akụkọ sị na website ndị uweojii na Finland na-akọwa na ha nwụchiri Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ maka ebubo ịyị ọha egwu na Naịjirịa.

Ha kwuru na “mbọ na mgbasa ọzị Simon Ekpa na-eme nyereaka na-ebute ọnọdụ ịyị ọha egwu, ma na-akwalite ọgbaaghara na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ, Naịjirịa.

Cheta na nke a abụghị mbụ ndị uweojii na-anwụchi Simon Ekpa maka ihe na-eme na Naịjirịa.

N'ọnwa Febụwarị afọ 2023 ka ndị uweojii mba Finland gbara ama na ha na-enyocha Simon Ekpa bụ onyeisi alaka otu nnwereonwe Biafra 'Indigenous People of Biafra (Ipob)' kpọrọ onwe ha 'autopilot'.

Ha nwuchiri Ekpa n'ụlọ ya dị na Lahti, Finland, n'ụtụtụ ụbọchị ahụ maka nnyocha ebubo na ọ na-anakọ ego nakwa na iji soshal midia eme ihe n'ụzọ megidere iwu.

Mana ha mechara tọhapụ ya n'abalị ụbọchị ahụ.